Native Bible

Numbers 3:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị.

Numbers 3:49 in English

Numbers 3:49 · Berean Standard Bible

So Moses collected the redemption money from those in excess of the number redeemed by the Levites.

Context

47bụ ego ruru shekel ise, na isi onye ọbụla, ụdị shekel ebe nsọ, nke ọtụtụ ya bụ iri gera abụọ. 48Were ego mgbapụta a nye Erọn na ụmụ ndị ikom ya.” 49Ya mere, Mosis natara ego mgbapụta ahụ nʼisi onye ọbụla dị nʼọnụọgụgụ ndị ahụ mara nʼelu ọnụọgụgụ ndị Livayị. 50Ego niile ọ natara site nʼaka ndị ikom Izrel niile e bụ ụzọ mụọ bụ ọlaọcha ruru puku shekel na narị shekel atọ na iri isii na ise (1,365), dịka ihe ọtụtụ shekel ebe nsọ si dị. 51Mosis nyere Erọn na ụmụ ya ego mgbapụta ndị a dịka Onyenwe anyị nyere ya nʼiwu. 3:6 Ndị Livayị dị iche na ndị nchụaja, ha bụ naanị ndị inyeaka nye ndị nchụaja. Ọ dị nʼakwụkwọ Ọnụ 8:6-22; 18:1-6 Ọ bụ naanị Erọn, na ụmụ ya bụ ndị na-aga ozi dịka ndị nchụaja. Nke a dị nʼakwụkwọ Ọnụ 18:7 3:15 Ndị ikom ebo Livayị adịghị eso ndị ikom Izrel ndị ọzọ a ga agha. Ya mere na-adịghị agụnye ha nʼọnụọgụgụ dịka a na-agụnye ndị ikom ebo ndị ọzọ mgbe ha gbara iri afọ abụọ. Ọgụgụ a gụrụ ndị ikom Livayị bụ nʼihi i were ha dochie anya ndị ikom niile e bu ụzọ mụọ nʼIzrel. Ọnụ 3:40-49

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.