Native Bible

Numbers 29:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu.

Numbers 29:5 in English

Numbers 29:5 · Berean Standard Bible

Include one male goat as a sin offering to make atonement for you.

Context

3Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule, 4na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla. 5Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu. 6Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ. 7“ ‘Nʼụbọchị nke iri nke ọnwa asaa ahụ, unu ga-enwekwa nzukọ dị nsọ. Unu ga-ebudata onwe unu nʼala. O nweghịkwa ụdị ọrụ ọbụla unu ga-arụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.