Ọnụọgụgụ 29:4
Numbers 29:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla.
Numbers 29:4 in English
Numbers 29:4 · Berean Standard Bible
and a tenth of an ephah * with each of the seven male lambs.
Context
2Nʼụbọchị ahụ, unu ga-achụ aja nsure ọkụ a ga-eji otu oke ehi, na ebule, na ụmụ atụrụ asaa gbara otu afọ, otu afọ ndị na-enweghị ntụpọ, chụọ. Nke a bụ aja na-adị Onyenwe anyị ezi mma, ma na-esi ya isi ụtọ. 3Aja mkpụrụ ọka ka a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a gwakọtara ya na mmanụ chụọ, nʼisi oke ehi ahụ, lita anọ na ọkara, nʼisi ebule, 4na lita abụọ, nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla. 5Tinyere otu mkpi a ga-eji chụọ aja maka mkpuchi mmehie unu. 6Aja ndị a niile bụ nke a ga-etinye nye nʼaja nsure ọkụ a na-achụ kwa ọnwa, na aja nsure ọkụ a na-achụ ụbọchị niile, ha na aja mkpụrụ ọka, na aja ihe ọṅụṅụ dịka e depụtara. Ha bụ aja ihe oriri a na-achụrụ Onyenwe anyị, aja nwere isisi dị ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.