Native Bible

Numbers 28:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee.

Numbers 28:9 in English

Numbers 28:9 · Berean Standard Bible

On the Sabbath day, present two unblemished year-old male lambs, accompanied by a grain offering of two-tenths of an ephah of fine flour * mixed with oil, as well as a drink offering.

Context

7Mmanya ga-eso aja a ga-abụ otu lita mmanya gbara ụka nʼisi otu atụrụ ọbụla, ị ga-awụsa aja ihe ọṅụṅụ a nʼebe nsọ nye Onyenwe anyị. 8Nʼoge anyasị, ị ga-ewerekwa nwa atụrụ nke abụọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dị ka i mere nʼụtụtụ, jiri chụọ aja. Nke a bụkwa aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị. 9“ ‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee. 10Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha. 11“ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.