Ọnụọgụgụ 28:3
Numbers 28:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile.
Numbers 28:3 in English
Numbers 28:3 · Berean Standard Bible
And tell them that this is the offering made by fire you are to present to the LORD as a regular burnt offering each day: two unblemished year-old male lambs.
Context
1Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Nye ndị Izrel iwu a sị ha, ‘Lezienụ anya hụ na unu na-eche nʼihu m, nʼoge niile a kara aka, nri ahụ a na-enye maka onyinye m a na-enye site nʼọkụ, nke isisi ya na-adị m ezi mma.’ 3Sị ha, ‘Nke a bụ onyinye unu na-enye site nʼọkụ nke unu na-eche nʼihu Onyenwe anyị: ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ, ka e jiri ha chụọ aja nsure ọkụ kwa ụbọchị niile. 4Chụọ otu nwa atụrụ nʼoge ụtụtụ, chụọkwa nke ọzọ nʼoge uhuruchi. 5Ị ga-ejikwa lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri akwọzi nke a gwọkọtara nʼotu lita mmanụ oliv asụrụ asụ, chụọ aja mkpụrụ ọka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.