Ọnụọgụgụ 28:18
Numbers 28:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ.
Numbers 28:18 in English
Numbers 28:18 · Berean Standard Bible
On the first day there is to be a sacred assembly; you must not do any regular work.
Context
16“ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka a ga-edebe Mmemme Ngabiga. Onyenwe anyị. 17Nʼụbọchị na-eso ya, bụ abalị iri na ise nke ọnwa ahụ ka a ga-eme mmemme. Nʼime abalị asaa ka a ga-eri achịcha a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee. 18Nʼụbọchị mbụ mmemme a bidoro, a ga-akpọ nzukọ dị nsọ nke ndị Izrel niile. Ọ dịghị ọrụ siri ike a ga-arụ nʼụbọchị ahụ. 19Unu ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara naanị otu afọ, otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ. 20Nʼisi otu oke ehi ọbụla, a ga-achụ aja mkpụrụ ọka nke a ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, a gwakọtara ya na mmanụ chụọ. Nʼisi ebule ọbụla, lita ụtụ ọka anọ na ọkara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.