Ọnụọgụgụ 27:20
Numbers 27:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nyekwa ha ụfọdụ ikike* gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi.
Numbers 27:20 in English
Numbers 27:20 · Berean Standard Bible
Confer on him some of your authority, so that the whole congregation of Israel will obey him.
Context
18Ya mere, Onyenwe anyị sịrị Mosis, “Kpọrọ Joshua, nwa Nun, onye nwere mmụọ Chineke nʼime ya, bikwasị ya aka gị. 19Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha. 20Nyekwa ha ụfọdụ ikike* gị, ka nzukọ niile nke ụmụ Izrel nwee ike rubere ya isi. 21Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu Elieza onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi Urim nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị Izrel niile, tinyekwara nzukọ niile.” 22Ya mere, Mosis mere dịka Onyenwe anyị nyere ya iwu. O duuru Joshua mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja na ọgbakọ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.