Native Bible

Numbers 25:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile.

Numbers 25:2 in English

Numbers 25:2 · Berean Standard Bible

who also invited them to the sacrifices for their gods. And the people ate and bowed down to these gods.

Context

1Mgbe Izrel bi na Shitim, ndị ikom ha malitere isoro ndị inyom Moab na-akwa iko. 2Ndị inyom a kpọrọ ha ka ha bịa soro na mmemme ịchụ aja nye chi ha niile. Ndị Izrel riri nri ihe aja ahụ, kpọọkwa isiala nye chi ndị a niile. 3Ya mere, ndị Izrel sonyere na-akpọ isiala nye chi Baal nke Peoa.* Nke a mere ka iwe Onyenwe anyị nwuru ọkụ megide ha. 4Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, “Duru ndị ndu ebo niile nke Izrel gbuo ha ma kwụnye ha nʼosisi nʼihu Onyenwe anyị nʼetiti ehihie, ka oke iwe Onyenwe anyị dị ọkụ ghara ịbịakwasị ndị Izrel.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.