Native Bible

Numbers 22:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m,

Numbers 22:10 in English

Numbers 22:10 · Berean Standard Bible

And Balaam said to God, “Balak son of Zippor, king of Moab, sent me this message:

Context

8Belam gwara ha okwu sị, “Nọdụnụ nʼebe a nʼabalị a. Aga m ewetara unu ọsịsa ọbụla Onyenwe anyị nyere m.” Ya mere, ndị ozi ahụ si Moab nọnyeere ya. 9Nʼabalị ahụ, Chineke bịakwutere Belam jụọ ya sị, “Ndị ikom ndị a bịara ileta gị, ha bụ ndị ole?” 10Belam sịrị Chineke, “Balak nwa Zipoa eze Moab zitere m ozi sị m, 11‘Otu ndị esitela nʼala Ijipt pụta, ndị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ. Achọrọ m ka ị bịa bụọrọ m ha ọnụ. Ma eleghị anya aga m enwe ike lụso ha agha, ma chụpụkwa ha.’ ” 12Ma Chineke sịrị Belam, “Esola ha aga! Ị gaghị abụ ndị a ọnụ, nʼihi na ha bụ ndị a gọziri agọzi.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.