Ọnụọgụgụ 21:2
Numbers 21:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.”
Numbers 21:2 in English
Numbers 21:2 · Berean Standard Bible
So Israel made a vow to the LORD: “If You will deliver this people into our hands, we will devote their cities to destruction.*”
Context
1Mgbe eze Kenan, bụ Arad, onye bi na Negev nụrụ na ndị Izrel na-agbaso ụzọ ahụ na-aga obodo Atarim, ọ chịkọtara ndị agha ya, pụkwuru ndị Izrel, lụso ha agha. Ọ dọtara ụfọdụ nʼime ha nʼagha. 2Mgbe ahụ, ndị Izrel kwere Onyenwe anyị nkwa sị, “Ọ bụrụ na ị ga-enyere anyị aka imeri eze Arad na ndị ya, anyị ga-ebibi obodo ha niile kpamkpam.” 3Onyenwe anyị ṅara ntị nʼarịrịọ ha, nyere ha aka imeri ndị Kenan ahụ. Mgbe ahụ, ụmụ Izrel bibiri obodo ha niile, na ndị niile bi nʼime ya. Ya mere, aha a kpọrọ ebe ahụ niile bụ Homa. 4Mgbe ahụ, ụmụ Izrel sitere nʼugwu Hor bilie ije ha, si ụzọ gawara Osimiri Uhie, ka ha nwee ike gaa gburugburu ala ndị Edọm. Ma ndị Izrel enweghị ntachiobi oge niile ha nọ nʼije a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.