Native Bible

Numbers 2:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ.

Numbers 2:32 in English

Numbers 2:32 · Berean Standard Bible

These are the Israelites, numbered according to their families. The total of those counted in the camps, by their divisions, was 603,550.

Context

30Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400). 31Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. 32Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ. 33Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ* ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị. 34Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị. 2:14 Nʼime ọtụtụ akwụkwọ ndị Masoreti, akwụkwọ ise nke ndị Samarịa nakwa akwụkwọ Vọlgetị, nʼisi mbụ na amaokwu iri na anọ ha, ihe e dere bụ Reuel 2:33 Ọnụ 1:47-49

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.