Ọnụọgụgụ 19:18
Numbers 19:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.
Numbers 19:18 in English
Numbers 19:18 · Berean Standard Bible
Then a man who is ceremonially clean is to take some hyssop, dip it in the water, and sprinkle the tent, all the furnishings, and the people who were there. He is also to sprinkle the one who touched a bone, a grave, or a person who has died or been slain.
Context
16“Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 17“Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute. 18Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka. 19Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha. 20Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ Onyenwe anyị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.