Ọnụọgụgụ 19:16
Numbers 19:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa.
Numbers 19:16 in English
Numbers 19:16 · Berean Standard Bible
Anyone in the open field who touches someone who has been killed by the sword or has died of natural causes, or anyone who touches a human bone or a grave, will be unclean for seven days.
Context
14“Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 15Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. 16“Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. 17“Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute. 18Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.