Ọnụọgụgụ 18:9
Numbers 18:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom.
Numbers 18:9 in English
Numbers 18:9 · Berean Standard Bible
A portion of the most holy offerings reserved from the fire will be yours. From all the offerings they render to Me as most holy offerings, whether grain offerings or sin offerings or guilt offerings, that part belongs to you and your sons.
Context
7Ma ọ bụ naanị gị, na ụmụ gị ndị ikom, ga-aga ozi dịka ndị nchụaja, ozi metụtara ebe ịchụ aja, na ihe niile dị nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Ana m enye gị ọrụ nchụaja dịka onyinye. Onye ọbụla ọzọ bịara nso ebe nsọ ahụ ga-anwụ.” 8Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị ya, “Mụ onwe m emeela gị onye nlekọta onyinye niile a na-eche nʼihu m, onyinye niile dị nsọ nke ụmụ Izrel wetara m ka m na-enye gị na ụmụ gị ndị ikom dịka oke ruuru unu site nʼụkpụrụ ebighị ebi.* 9Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom. 10A ga-eri ha dịka ihe dịkarịrị nsọ. Nwa nwoke ọbụla ga-eri ya. Unu ga-agụ ha dịka ihe dị nsọ. 11“Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.