Native Bible

Numbers 18:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya.

Numbers 18:11 in English

Numbers 18:11 · Berean Standard Bible

And this is yours as well: the offering of their gifts, along with all the wave offerings of the Israelites. I have given this to you and your sons and daughters as a permanent statute. Every ceremonially clean person in your household may eat it.

Context

9Unu ga-enwere akụkụ aja ahụ kachasị nsọ nke a na-edopụ iche site nʼọkụ. Site nʼonyinye niile nke a na-ewetara m, bụ onyinye mkpụrụ ọka maọbụ aja mmehie maọbụ aja ikpe ọmụma, ndị ahụ a na-edopụ iche dịka ihe kachasị nsọ, ha ga-abụ oke gị na ụmụ gị ndị ikom. 10A ga-eri ha dịka ihe dịkarịrị nsọ. Nwa nwoke ọbụla ga-eri ya. Unu ga-agụ ha dịka ihe dị nsọ. 11“Nke a bụkwa nke gị: Ihe ọbụla nke ewezugara site nʼonyinye nke aja mfufe niile nke ndị Izrel wetara. Mụ onwe m na-ewere nke a nye gị na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom dịka oke unu nʼụkpụrụ ebighị ebi. Onye ọbụla nke dooro onwe ya ọcha nʼezinaụlọ nwere ike iri ya. 12“Ana m enye gị mmanụ oliv nke kachasị mma, na mmanya ọhụrụ nke kachasị mma na ọka, bụ mkpụrụ mbụ nke owuwe ihe ubi ha na-ewetara Onyenwe anyị. 13Mkpụrụ mbụ nke ihe niile dị nʼala nke ha na-ewebatara Onyenwe anyị, ga-abụ nke gị. Onye ọbụla nke dị ọcha nʼezinaụlọ unu nwere ike iso rie ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.