Ọnụọgụgụ 16:36
Numbers 16:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya,
Numbers 16:36 in English
Numbers 16:36 · Berean Standard Bible
Then the LORD said to Moses,
Context
34Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.” 35Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. 36Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 37“Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile. 38Ha bụ ihe ịgụ ọkụ nke ndị ikom sitere na mmehie ha tufuo ndụ ha. Ka etipịa ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ. Mee ha ka ha ghọọ ihe sara mbara nke a ga-eji machite ebe ịchụ aja, nʼihi na e chere ha nʼihu Onyenwe anyị, ha aghọọla ihe dị nsọ. Ka ha bụrụ ihe ịrịbama nye ndị Izrel niile.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.