Native Bible

Numbers 16:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.

Numbers 16:35 in English

Numbers 16:35 · Berean Standard Bible

And fire came forth from the LORD and consumed the 250 men who were offering the incense.

Context

33Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. 34Ndị Izrel niile nọ ha gburugburu gbara ọsọ, mgbe ha tiri mkpu akwa, na-asị, “Ala na-agakwa iloda anyị.” 35Mgbe ahụ, ọkụ si nʼebe Onyenwe anyị nọ dara, rechapụ narị mmadụ abụọ na iri ise ndị ahụ na-enye onyinye aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. 36Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 37“Gwa Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka o site nʼọkụ ahụ wepụta ihe ịgụ ọkụ ndị ahụ niile nʼihi na ha dị nsọ. Ọ ga-ekposakwa icheku ọkụ niile nʼakụkụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.