Native Bible

Numbers 16:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja?

Numbers 16:10 in English

Numbers 16:10 · Berean Standard Bible

He has brought you near, you and all your fellow Levites, but you are seeking the priesthood as well.

Context

8Mgbe ahụ, Mosis gwakwara Kora okwu ọzọ sị ya, “Ugbu a, geenụ ntị, unu ndị Livayị! 9Ọ bụ ihe dị nta nʼanya unu na Chineke nke Izrel kewapụtara unu site na nzukọ ndị Izrel niile, mee ka unu bịaruo ya nso, nʼihi ije ozi nʼụlọ nzute Onyenwe anyị, nakwa iguzo nʼihu nzukọ Izrel niile ijere ha ozi*? 10Ọ kpọbatala gị na ndị Livayị ibe gị nso ebe ọ nọ. Ugbu a, unu na-achọkwa ọrụ nchụaja? 11Ọ bụ Onyenwe anyị ka gị na ndị sonyeere gị gbara izu megide. Onye ka Erọn bụ unu ji atamu ntamu megide ya?” 12Mgbe ahụ, Mosis ziri ozi ka a kpọọ Datan na Abiram, ụmụ ndị ikom Eliab, ma ha sịrị, “Anyị agaghị abịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.