Ọnụọgụgụ 15:23
Numbers 15:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa.
Numbers 15:23 in English
Numbers 15:23 · Berean Standard Bible
all that the LORD has commanded you through Moses from the day the LORD gave them and continuing through the generations to come—
Context
21Unu aghaghị inye Onyenwe anyị onyinye a sitere nʼọka mbụ ọbụla unu kwọrọ, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 22“ ‘Ọ bụrụ na unu amaghị ama ghara idebe iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis, 23bụ iwu ndị a niile Onyenwe anyị nyere unu site nʼaka Mosis, site nʼụbọchị ahụ Onyenwe anyị nyere ha ruo nʼọgbọ niile nke na-abịa. 24Ọ bụrụ na e mere ya na-amaghị ama, ọ bụrụ na ọgbakọ ụmụ Izrel amaghị ama mee ya, mgbe ahụ, ọgbakọ ụmụ Izrel ga-eji nwa oke ehi chụọ aja nsure ọkụ, aja na-esi isi ụtọ nke Onyenwe anyị na-anabata. Aghaghị iwetakwa mkpụrụ ọka, na onyinye ihe ọṅụṅụ nke ya na aja ahụ so, tinyere otu mkpi maka aja mmehie. 25Onye nchụaja ga-ekpuchitere nzukọ Izrel niile mmehie ha. A ga-agbagharakwa ha mmehie ha niile, nʼihi na ọ bụ mmehie ha mere na-amaghị ama. Ha e cheela nʼihu Onyenwe anyị aja onyinye nri nʼihi amaghị ama ha ya na aja mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.