Ọnụọgụgụ 14:33
Numbers 14:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara.
Numbers 14:33 in English
Numbers 14:33 · Berean Standard Bible
Your children will be shepherds in the wilderness for forty years, and they will suffer for your unfaithfulness until the last of your bodies lies in the wilderness.
Context
31Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya. 32Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a. 33Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara. 34Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya. 35Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.