Native Bible

Numbers 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo.

Numbers 14:17 in English

Numbers 14:17 · Berean Standard Bible

So now I pray, may the power of my Lord be magnified, just as You have declared:

Context

15Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị, 16‘Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’ 17“Ugbu a ka Onyenwe anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo. 18Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ. 19Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ Ijipt ruo ugbu a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.