Native Bible

Numbers 14:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha.

Numbers 14:11 in English

Numbers 14:11 · Berean Standard Bible

And the LORD said to Moses, “How long will this people treat Me with contempt? How long will they refuse to believe in Me, despite all the signs I have performed among them?

Context

9Unu enupukwala isi megide Onyenwe anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.” 10Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube Onyenwe anyị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile. 11Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha. 12Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.” 13Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.