Ọnụọgụgụ 13:23
Numbers 13:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl,* ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig.
Numbers 13:23 in English
Numbers 13:23 · Berean Standard Bible
When they came to the Valley of Eshcol,* they cut down a branch with a single cluster of grapes, which they carried on a pole between two men. They also took some pomegranates and figs.
Context
21Ya mere ndị a gara ledoo ala ahụ anya site nʼọzara Zin ruo na Rehob, nke dị nso na Lebo Hamat. 22Ha gara site na Negev rute Hebrọn, ebe Ahiman na Sheshai na Talmai, ụmụ ụmụ Anak bi. (Ma ewuru Hebrọn afọ asaa tupu e wuo obodo Zoan dị nʼIjipt.) 23Mgbe ha rutere Ndagwurugwu Eshkọl,* ha gbutere otu alaka osisi vaịnị nke nwere ụyọkọ mkpụrụ vaịnị. Mmadụ abụọ butere ya nʼosisi tinyere ụfọdụ mkpụrụ osisi pomegranet na fiig. 24A kpọrọ ebe ahụ Ndagwurugwu Eshkọl, nʼihi ụyọkọ mkpụrụ osisi vaịnị ndị Izrel gbutere nʼebe ahụ. 25Mgbe iri abalị anọ gasịrị, ndị nledo a sitere nʼije ha lọghachi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.