Ọnụọgụgụ 11:10
Numbers 11:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu.
Numbers 11:10 in English
Numbers 11:10 · Berean Standard Bible
Then Moses heard the people of family after family weeping at the entrances to their tents, and the anger of the LORD was kindled greatly, and Moses was also displeased.
Context
8Ndị Izrel na-ejegharị na-achịkọta ha. Emesịa, ha na-eji nkume e ji akwọ nri na-akwọri ha. Oge ụfọdụ, ha na-eji ikwe nri sụọ ya. Emesịa, ha na-esi ya esi, maọbụ ghee ya eghe. Ọ na-atọ dịka ihe e ji mmanụ oliv ghee. 9Mánà ndị a na-ada mgbe igirigi dara nʼọmụma ụlọ ikwu nʼabalị. 10Mosis nụrụ mkpu akwa ụmụ Izrel niile, nke na-ada nʼezinaụlọ ọbụla nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha. Iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu. Otu a kwa, obi jọrọ Mosis njọ nke ukwuu. 11Mosis jụrụ Onyenwe anyị sị, “Gịnị mere i ji bokwasị ohu gị nsogbu dị otu a nʼisi? Gịnị ka m mere na m ahụtakwaghị amara nʼebe ị nọ, nke mere i ji bukwasị m ibu arọ nke ilekọta ndị a? 12Ọ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ bụ m mụrụ ha? Gịnị mere i ji si m kuru ha nʼaka m gawa nʼala ahụ ị ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha,* dịka m bụ nne nwa na-ekugharị nwantakịrị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.