Native Bible

Numbers 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị.

Numbers 10:4 in English

Numbers 10:4 · Berean Standard Bible

But if only one is sounded, then the leaders, the heads of the clans of Israel, are to gather before you.

Context

2“Kpụọ opi ọlaọcha abụọ, jiri ha na-akpọ mkpọkọta nzukọ ụmụ Izrel na ime ka ha mara mgbe mbuli ije nke ọmụma ụlọ ikwu ruru. 3Mgbe a fụrụ opi abụọ ahụ, nzukọ Izrel niile ga-ezukọta nʼihu gị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. 4Ma ọ bụrụ naanị otu opi ka a fụrụ, ọ bụ ndị ndu, ndịisi ikwu Izrel niile ga-ezukọta bịakwute gị. 5Otu ụda opi ike ga-egosi na ebo Izrel niile mara ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebuli ije. 6Opi ike ahụ daa ụda nke ugboro abụọ, ọ na-egosi na ndị mara ụlọ ikwu ha na ndịda ga-ebuli ije. Ịda ụda nke opi ike bụ ihe e ji amata na oge ibuli ije eruola.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.