Ọnụọgụgụ 10:12
Numbers 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran.
Numbers 10:12 in English
Numbers 10:12 · Berean Standard Bible
and the Israelites set out from the Wilderness of Sinai, traveling from place to place until the cloud settled in the Wilderness of Paran.
Context
10Unu ga-egbukwa opi ndị a nʼoge aṅụrị, nʼoge mmemme unu a kara aka, na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ niile. Gbukwaanụ opi mgbe unu na-achụ aja nsure ọkụ unu, na aja udo unu niile. Ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta unu nʼihu Chineke unu. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu.” 11Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 12Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran. 13Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka Onyenwe anyị si nye Mosis iwu banyere ije ha. 14Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.