Nehemaya 9:33
Nehemiah 9:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume.
Nehemiah 9:33 in English
Nehemiah 9:33 · Berean Standard Bible
You are just in all that has befallen us, because You have acted faithfully, while we have acted wickedly.
Context
31Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara. 32“Ugbu a, Chineke anyị, Chineke dị ukwuu, onye dị ike dịkwa ebube, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya, ka ọnọdụ ihe isi ike a ghara ịbụ ihe nta nʼanya gị. Ntaramahụhụ nke dakwasịrị anyị, ndị eze anyị na ndị ndu anyị, ndị nchụaja anyị, ndị amụma anyị, nna nna anyị ha na ndị gị niile, site nʼoge ndị eze Asịrịa buru ụzọ lụgbuo anyị nʼagha tutu ruo taa. 33Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume. 34Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe. 35Ọ bụladị mgbe ha nọ nʼalaeze nke aka ha na-ekpori ndụ, nke oke ịdị mma gị nke ị mere ka o rute ha aka, nʼala ọma ahụ sara mbara nwere ume i nyere ha, ha efeghị gị ofufe, ha esitekwaghị nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.