Native Bible

Nehemiah 9:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ugbu a, Chineke anyị, Chineke dị ukwuu, onye dị ike dịkwa ebube, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya, ka ọnọdụ ihe isi ike a ghara ịbụ ihe nta nʼanya gị. Ntaramahụhụ nke dakwasịrị anyị, ndị eze anyị na ndị ndu anyị, ndị nchụaja anyị, ndị amụma anyị, nna nna anyị ha na ndị gị niile, site nʼoge ndị eze Asịrịa buru ụzọ lụgbuo anyị nʼagha tutu ruo taa.

Nehemiah 9:32 in English

Nehemiah 9:32 · Berean Standard Bible

So now, our God, the great and mighty and awesome God who keeps His gracious covenant, do not view lightly all the hardship that has come upon us, and upon our kings and leaders, our priests and prophets, our ancestors and all Your people, from the days of the kings of Assyria until today.

Context

30Ma i sitere na ntachiobi gị nye ha ogologo oge ichegharị; ị dọrọ ha aka na ntị site nʼọnụ ndị amụma gị, ma ha egeghị ntị. Ya mere, i kwenyekwara ka ndị iro ha merie ha ọzọ. 31Ma nʼihi obi ebere gị i bibighị ha kpamkpam; ị gbakụtakwaghị ha azụ nʼihi na ị bụ Chineke onye dị ebere na onye amara. 32“Ugbu a, Chineke anyị, Chineke dị ukwuu, onye dị ike dịkwa ebube, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya, ka ọnọdụ ihe isi ike a ghara ịbụ ihe nta nʼanya gị. Ntaramahụhụ nke dakwasịrị anyị, ndị eze anyị na ndị ndu anyị, ndị nchụaja anyị, ndị amụma anyị, nna nna anyị ha na ndị gị niile, site nʼoge ndị eze Asịrịa buru ụzọ lụgbuo anyị nʼagha tutu ruo taa. 33Ma gị onwe gị bụ onye ezi omume, nʼihe niile bịakwasịrị anyị; Ị mere ihe kwesiri, ebe anyị onwe anyị mere ajọ omume. 34Ndị eze anyị, ndị ndụ anyị na ndị nchụaja na nna nna anyị edebeghị iwu gị; ha aṅaghịkwa ntị nʼihe niile i nyere nʼiwu maọbụ ihe ama gị nke ị dọrọ ha aka na ntị idebe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.