Nehemaya 9:22
Nehemiah 9:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan.
Nehemiah 9:22 in English
Nehemiah 9:22 · Berean Standard Bible
You gave them kingdoms and peoples and allotted to them every corner of the land. So they took the land of Sihon * king of Heshbon and of Og king of Bashan.
Context
20I zitere ezi Mmụọ nke gị ime ka ha nwee uche. Ị gbochikwaghị mánà gị iru ha ọnụ, ị nyekwara ha mmiri nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ ha. 21Iri afọ anọ ka i debere ha ndụ nʼọzara. Ọ dịghị ihe kọrọ ha nʼoge ahụ. Uwe ha akaghị nka, ukwu ha azaghị. 22“I nyere ha alaeze na mba dị iche iche, kenye ha ọbụladị ebe ndị dịkarịsịrị anya. Ha nwetara ala Saịhọn bụ eze Heshbọn, na ala Ọg bụ eze Bashan. 23I mere ka ụmụ Izrel mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe, ị kpọbatara ha nʼala ahụ i gwara ndị bụ nna ha ka ha baa nweta. 24Ụmụ ha banyere nweta ala ahụ. I meriri ndị Kenan nʼihu ha, bụ ndị bi nʼala ahụ. I weere ndị Kenan ahụ nyefee nʼaka ha, ha na ndị eze ha, na ndị niile bi nʼala ahụ ka ndị gị jiri ha mee ihe ọbụla ha kpebiri nʼobi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.