Native Bible

Nehemiah 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya.

Nehemiah 7:6 in English

Nehemiah 7:6 · Berean Standard Bible

These are the people of the province who came up from the captivity of the exiles carried away to Babylon by Nebuchadnezzar its king. They returned to Jerusalem and Judah, each to his own town,

Context

4Nʼoge a obodo ahụ buru ibu dịkwa mbara, ma ndị bi nʼime ya dị ole na ole nʼọnụọgụgụ, ụlọ ndị dị nʼime ya bụkwa ihe ewugharịbeghị. 5Ya mere Chineke m tinyere ya nʼobi m ka m chịkọta ndị niile a na-asọpụrụ, ndị ọchịchị, na ndị niile bi nʼobodo, maka idebanye aha nʼakwụkwọ ezinaụlọ nʼezinaụlọ. Achọtara m ebe e depụtara usoro ndị mmadụ niile bụ ụzọ lọta Juda nʼoge gara aga. Nke a bụ ihe m chọpụtara edere nʼime ya: 6Ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa nʼala ọzọ. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke aka ya. 7Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya, Azaraya, Raamaya, Nahamani, Mọdekai, Bilshan, Misperet, Bigvai, Nehum na Baana. Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a: 8Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172),

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.