Native Bible

Nehemiah 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ.

Nehemiah 6:4 in English

Nehemiah 6:4 · Berean Standard Bible

Four times they sent me the same message, and each time I gave the same reply.

Context

2Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ. 3Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?” 4Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ. 5Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa. 6Nke a bụ ihe e dere nʼime ya; “Anụla ya na mba niile, Geshem kwukwara otu ihe ahụ, na gị na ndị Juu na-akwado inupu isi. Ọ bụ ya mere i ji na-ewu mgbidi ahụ. Ozi ahụ na-ekwukwa na gị onwe gị na-achọ ịbụ eze ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.