Native Bible

Nehemiah 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?”

Nehemiah 6:3 in English

Nehemiah 6:3 · Berean Standard Bible

So I sent messengers to them, saying, “I am doing a great work and cannot come down. Why should the work stop while I leave it to go down to you?”

Context

1Mgbe a gwara Sanbalat, na Tobaya, na Geshem onye Arab, na ndị iro anyị ndị ọzọ na m ewuzichaala mgbidi ahụ, na ọ dịkwaghị ntipu fọdụrụ na ya, ọ bụ ezie na nʼoge ahụ, etinyebeghị m ibo nʼọnụ ụzọ ama ya niile, 2Sanbalat na Geshem zitere m ozi a, “Bịa ka anyị zụkọta nʼotu obodo nta nke dị nʼobosara ala Ono.” Ma ha na-achọ ụzọ imerụ m ahụ. 3Ya mere, azara m ha site nʼaka ndị ozi sị, “Ana m arụ ọrụ dị oke mkpa, agaghị enwe ike ịrịdata. Nʼihi gịnị ka ọrụ a ga-eji kwụsị mgbe m ga-ahapụ ya ịbịa nʼebe ị nọ?” 4Ha zitere ozi ahụ ugboro anọ, ma enyere m ha otu ọsịsa ahụ ugboro anọ. 5Na nke ugboro ise, Sanbalat ziteere m onye na-ejere ya ozi, ya na akwụkwọ ozi nke e mechighị emechi o ji bịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.