Native Bible

Nehemiah 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọ, nʼime afọ iri na abụọ ahụ a họpụtara m ị bụ onyeisi ọchịchị na Juda, site nʼiri afọ abụọ nke ịbụ eze Ataksekses ruo nʼafọ iri atọ na abụọ ya, mụ na ụmụnne m esiteghị na nri a na-atụkọrọ onyeisi ọchịchị were ihe oriri ọbụla.

Nehemiah 5:14 in English

Nehemiah 5:14 · Berean Standard Bible

Furthermore, from the day King Artaxerxes appointed me to be their governor in the land of Judah, from his twentieth year until his thirty-second year (twelve years total), neither I nor my brothers ate the food allotted to the governor.

Context

12Ha sịrị, “Anyị ga-enyeghachi ha. Anyị agakwaghị anara ha ihe ọzọ. Anyị ga-emezu ihe i kwuru.” Mgbe ahụ, akpọkọtara m ndị nchụaja, mee ka ndị ndu na ndịisi ozi ṅụọ iyi imezu nkwa ha. 13Ayọgharịrị m ọnụ ọnụ uwe mwụda m sị, “Otu a ka Chineke ga-esi yọchapụ site nʼụlọ ha na ihe nweta ha onye ọbụla nke na-agaghị edebezu nkwa a.” Ndị niile zukọrọ kwere sị, “Amen.” Ha tokwara Onyenwe anyị: Ha niile mekwara ihe ha kwere na nkwa. 14Ọzọ, nʼime afọ iri na abụọ ahụ a họpụtara m ị bụ onyeisi ọchịchị na Juda, site nʼiri afọ abụọ nke ịbụ eze Ataksekses ruo nʼafọ iri atọ na abụọ ya, mụ na ụmụnne m esiteghị na nri a na-atụkọrọ onyeisi ọchịchị were ihe oriri ọbụla. 15Ma ọ bụghị otu a ka o si dị na mbụ, nʼihi na ndịisi ọchịchị niile buru m ụzọ chịa boro ndị ahụ ibu arọ dị ukwuu. Ha na-anakọta site nʼaka onye ọbụla iri mkpụrụ ọlaọcha anọ, tinyere ihe oriri na mmanya ha na-ewebatakwa. Ọbụladị ndị na-enyere ha aka mekpakwara ndị mmadụ ahụ. Ma emeghị m otu a, nʼihi ịtụ egwu Chineke. 16Kama, anọgidesiri m ike nʼọrụ iwugharị mgbidi ahụ, achịkọtara ndị ikom m niile nʼebe ahụ nʼihi ije ozi a. Ọ dịghịkwa ala anyị zụrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.