Native Bible

Nehemiah 3:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya.

Nehemiah 3:22 in English

Nehemiah 3:22 · Berean Standard Bible

And next to him, the priests from the surrounding area made repairs.

Context

20Onye ọzọ na-eso ya bụ Baruk, nwa Zabai, onye ji nnọọ ịnụ ọkụ nʼobi rụzie mgbidi ahụ site na nkuku ya ruo nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọ Eliashib, bụ onyeisi nchụaja. 21Onye na-eso ya bụ Meremot nwa Ụraya, nwa Hakoz. Ọ sitere nʼọnụ ụzọ ụlọ Eliashib rụziri ruo na ngwụcha ya. 22Ndị nchụaja si nʼakụkụ Jerusalem wuziri akụkụ nke na-esote ya. 23Isonye ha, Benjamin na Hashub wuziri akụkụ ahụ dị nʼihu ụlọ ha. Azaraya nwa Maaseia, onye bụkwa nwa nwa Ananaya wuziri nke na-esote ya, nke dịkwa nʼakụkụ ụlọ ya. 24Binui nwa Henadad wuziri akụkụ nke ọzọ, nke sitere nʼihu ụlọ Azaraya ruo na nkuku mgbidi ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.