Nehemaya 11:2
Nehemiah 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem.
Nehemiah 11:2 in English
Nehemiah 11:2 · Berean Standard Bible
And the people blessed all the men who volunteered to live in Jerusalem.
Context
1Ugbu a, ndịisi Izrel bi nʼobodo nsọ Jerusalem nʼoge a, ma e sitere nʼife nza họpụta otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ndị bi nʼobodo ndị ọzọ niile ka ha bịa biri na Jerusalem, bụ obodo nsọ ahụ, ebe ụzọ itoolu fọdụrụ bikwa nʼobodo nke aka ha. 2Ndị mmadụ toro ndị niile jiri afọ ofufu họrọ ịbịa soro biri na Jerusalem. 3Ndị a bụ ndịisi ala ahụ a na-achị achị ndị bịara biri na Jerusalem (ma ọtụtụ ndị Izrel, ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ na ụmụ ndị na-ejere Solomọn ozi biiri nʼobodo Juda, onye ọbụla nʼihe onwunwe ya nʼobodo ha dị iche iche. 4Ebe ndị ọzọkwa bụ ndị sitere na Juda na Benjamin, biiri na Jerusalem).
Ndị sitere nʼagbụrụ Juda bụ ndị a:
Ataia nwa Uzaya, nwa Zekaraya, nwa Amaraya, nwa Shefataya, nwa Mahalalel, nwa Perez;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.