Nehemaya 1:8
Nehemiah 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche.
Nehemiah 1:8 in English
Nehemiah 1:8 · Berean Standard Bible
Remember, I pray, the word that You commanded Your servant Moses when You said, ‘If you are unfaithful, I will scatter you among the nations,
Context
6Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ Izrel, ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị. 7Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị Mosis. 8“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. 9Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’ 10“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.