Native Bible

Nehemiah 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta.

Nehemiah 1:10 in English

Nehemiah 1:10 · Berean Standard Bible

They are Your servants and Your people. You redeemed them by Your great power and mighty hand.

Context

8“Chetakwa ntụziaka inyere Mosis bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. 9Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na Jerusalem bụ obodo m họpụtara nye Aha m.’ 10“Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta. 11Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.*” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze. 1:1 Nke a bụ ọnwa itoolu nʼafọ. Zek 7:1 1:1 Nke bụ mgbe narị afọ itoolu nʼotu gasịrị site na mgbe ndị mbụ si Babilọn lọghachitara. Ọ bụ na Senchuri nke anọ tupu a mụọ Kraịst. Neh 2:1 1:1 Ọ bụ ụlọeze dị na ndagwurugwu mmiri Taịgris, ebe ndị eze atọ chịrị obodo Peshịa na-ebi nʼoge oke oyi. Est 1:2; Dan 8:2 1:2 Ọ ga-abụ onye nne ji ya na Nehemaya, onye bịara zie ya ozi banyere ọnọdụ Jerusalem. Neh 7:2 1:3 E kewara alaeze Peshịa mpaghara atọ. Nʼobodo Sameria ka ndị na-achị mpaghara Juda nọ. 1:11 Eze a na-ekwu maka ya nʼebe bụ Ataksekses, Ezr 4:21

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.