Nehemaya 1:3
Nehemiah 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara* nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.”
Nehemiah 1:3 in English
Nehemiah 1:3 · Berean Standard Bible
And they told me, “The remnant who survived the exile are there in the province, in great trouble and disgrace. The wall of Jerusalem is broken down, and its gates are burned with fire.”
Context
1Nke a bụ okwu Nehemaya nwa Hakalaya:
Nʼọnwa Kislev,* nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị Ataksekses* mgbe m nọ nʼụlọeze dị na Susa,* 2otu nwanne m nwoke aha ya bụ Hanani,* na ụfọdụ ndị ọzọ sitere Juda bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị Juu ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka Jerusalem. 3Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara* nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.” 4Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ Chineke nke eluigwe arịrịọ, 5si ya:
“Gị, Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.