Mak 8:28
Mark 8:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
Mark 8:28 in English
Mark 8:28 · Berean Standard Bible
They replied, “Some say John the Baptist; others say Elijah; and still others, one of the prophets.”
Context
26Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya, “Abanyekwala nʼime obodo.” 27Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?” 28Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọkwa sị na ị bụ Ịlaịja maọbụ otu nʼime ndị amụma.” 29Ma ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
Pita zara sị, “Ị bụ Kraịst* ahụ.” 30Ọ dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọbụla ihe banyere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.