Mak 6:36
Mark 6:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.”
Mark 6:36 in English
Mark 6:36 · Berean Standard Bible
Dismiss the crowd so they can go to the surrounding countryside and villages and buy themselves something to eat.”
Context
34Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe. 35Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala. 36Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.” 37Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.”
Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị* abụọ, iji nye ha ka ha rie?” 38Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.”
Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.