Native Bible

Mark 6:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.”

Mark 6:24 in English

Mark 6:24 · Berean Standard Bible

Then she went out and asked her mother, “What should I request?” And her mother answered, “The head of John the Baptist.”

Context

22Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.” 23O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.” 24Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.” 25Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.” 26O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.