Mark 5:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!”
Mark 5:8 in English
Mark 5:8 · Berean Standard Bible
For Jesus had already declared, “Come out of this man, you unclean spirit!”
Context
6Mgbe o sitere nʼebe dị anya hụ Jisọs, ọ gbaara ọsọ gaa gbuo ikpere nʼihu ya. 7O tiri mkpu nʼoke olu sị, “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke Onye kachasị ihe niile elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko, atala m ahụhụ.” 8Nʼihi na o nyela ya iwu sị, “Si nʼime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha!” 9Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ya sị, “Gịnị bụ aha gị?”
Mmụọ ọjọọ ahụ zaghachiri ya sị, “Aha m bụ Lijiọn,* nʼihi na anyị dị ọtụtụ.” 10Ma ọ rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara ịchụpụ ha site nʼobodo ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.