Native Bible

Mark 5:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu.

Mark 5:42 in English

Mark 5:42 · Berean Standard Bible

Immediately the girl got up and began to walk around. She was twelve years old, and at once they were utterly astounded.

Context

40Ma ha chịrị ya ọchị. Mgbe ọ chụpụsịrị ha niile nʼezi, ọ kpọọrọ nne na nna nwantakịrị ahụ, na ndị ya na ha so, banye nʼime ụlọ ebe nwantakịrị ahụ dina. 41O jidere ya nʼaka sị ya, “Talita koum!” (nke pụtara, “Nwa agbọghọ nta, asị m gị bilie!”). 42Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu. 43Ma ọ dọsiri ha aka na ntị ike, ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie.” 5:1 Nʼakwụkwọ ochie ụfọdụ, ị nwere ike hụ Gadarin. 5:9 Nke a bụ site na puku atọ ruo puku isii nʼọnụọgụgụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.