Mak 14:71
Mark 14:71 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.”
Mark 14:71 in English
Mark 14:71 · Berean Standard Bible
But he began to curse and swear, “I do not know this man of whom you speak!”
Context
69Mgbe nwaagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nʼebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nʼime ha.” 70Ma ọ gọkwara agọ ọzọ.
Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ otu nʼime ha, nʼihi na ị bụ onye Galili.” 71Mgbe ahụ o bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi na-asị, “Amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.” 72Nʼotu oge ahụ, oke ọkụkụ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara okwu Jisọs gwara ya sị, “Tupu oke ọkụkụ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Obi tiwara ya mee ka ọ kwaa akwa.
14:1 Mmemme ndị Izrel ji echeta ọpụpụ ha site nʼala Ijipt.
14:27 Zek 13:7
14:36 Nke a pụtara nna nʼasụsụ Aramaik.
14:55 Ha dị iri asaa nʼotu nʼọnụọgụgụ ma bụrụkwa ndị gbara site nʼafọ atọ nʼotu gaa nʼihu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.