Mak 14:59
Mark 14:59 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
Mark 14:59 in English
Mark 14:59 · Berean Standard Bible
But even their testimony was inconsistent.
Context
57Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị, 58“Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ” 59Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu. 60Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?” 61Ma ọ gbakwara nkịtị, ọ zaghị ihe ọbụla.
Ọzọkwa, onyeisi nchụaja jụrụ ya sị, “Ị bụ Kraịst, Ọkpara Onye a gọziri agọzi?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.