Mak 14:17
Mark 14:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa.
Mark 14:17 in English
Mark 14:17 · Berean Standard Bible
When evening came, Jesus arrived with the Twelve.
Context
15Ọ ga-egosi unu otu ọnụụlọ buru ibu nʼelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe niile. Kwadoonụ ihe anyị nʼebe ahụ.” 16Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ baa nʼime obodo, ha hụrụ ihe niile dị ka ọ gwara ha. Ma kwadokwa nri ngabiga ahụ. 17Mgbe o ruru uhuruchi, ya na ndị ozi ya iri na abụọ ahụ so bịa. 18Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, otu onye nʼime unu ga-arara m nye. E, otu onye so m ugbu a na-eri nri!” 19Ha bidoro inwe obi mwute, na-asị ya nʼotu nʼotu, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.