Mak 13:23
Mark 13:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị.
Mark 13:23 in English
Mark 13:23 · Berean Standard Bible
So be on your guard; I have told you everything in advance.
Context
21Nʼoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọbụla asị unu, ‘Lee, Kraịst nọ nʼebe a,’ maọbụ, ‘Lee, ọ nọ nʼebe ahụ,’ unu ekwela. 22Nʼihi na ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha, ga-apụta ma rụọkwa ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama dị iche iche iji duhie ndị a họpụtara ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee. 23Ya mere, unu nọrọ na nche; nʼihi na agwala m unu ihe niile mgbe ha na-emebeghị. 24“Nʼụbọchị ndị ahụ, nke na-esote oge mkpagbu ahụ,
“ ‘anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,
ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya; 25kpakpando ga-esi na mbara eluigwe na-ada,
ike niile dị na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.’*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.