Mak 11:31
Mark 11:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’
Mark 11:31 in English
Mark 11:31 · Berean Standard Bible
They deliberated among themselves what they should answer: “If we say, ‘From heaven,’ He will ask, ‘Why then did you not believe him?’
Context
29Jisọs sịrị ha, “Aga m ajụ unu otu ajụjụ, unu zaa m ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a. 30Baptizim nke Jọn, o sitere nʼeluigwe ka ọ bụ nʼaka mmadụ? Gwanụ m.” 31Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha ma sị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ 32Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O sitere nʼaka mmadụ.’ ” (Ha na-atụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma nʼezie.) 33Ya mere ha zara Jisọs sị, “Anyị amaghị.”
Jisọs zaghachikwara ha sị, “Agakwaghị m agwa unu ụdị ikike m ji na-eme ihe ndị a.”
11:9 Okwu a Hozanna, pụtara Zọpụta nʼasụsụ Hibru, nke mechara ghọọ mkpu otuto.
11:9 Abụ 118:25,26
11:17 Aịz 56:7
11:17 Jer 7:11
11:26 Ụfọdụ akwụkwọ na-edebanye okwu ndị a dịka ọ dị nʼakwụkwọ Mat 6:15.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.