Native Bible

Mark 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?”

Mark 10:3 in English

Mark 10:3 · Berean Standard Bible

“What did Moses command you?” He replied.

Context

1Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼobodo ndị dị na mpaghara Judịa ma gafeekwa nʼofe Jọdan. Igwe mmadụ bịakwutekwara ya, ọzọ, dị ka o si emekwa, o ziri ha ihe. 2Ụfọdụ ndị Farisii bịara, ma nʼihi ị nwalee ya, ha jụrụ ya sị, “O ziri ezi nʼiwu ka nwoke gbaa nwunye ya alụkwaghị m?” 3Ma ọ zara ha sị, “Gịnị ka Mosis nyere unu nʼiwu?” 4Ha sịrị, “Mosis kwenyere ka nwoke dee asambodo alụkwaghị m, nye nwunye ya ma zilaga ya.” 5Jisọs sịrị ha, “Ọ bụ nʼihi na obi unu siri ike nke ukwuu ka o ji deere unu iwu a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.