Native Bible

Mark 1:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha.

Mark 1:42 in English

Mark 1:42 · Berean Standard Bible

And immediately the leprosy left him, and the man was cleansed.

Context

40Otu onye ekpenta bịakwutere ya gbuo ikpere nʼala rịọọ ya sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” 41Ebe o jupụtara nʼọmịiko, Jisọs setịpụrụ aka ya metụ ya sị, “Achọrọ m, dị ọcha!” 42Ngwangwa ekpenta ya hapụrụ ya, e mekwara ka ọ dị ọcha. 43Mgbe ahụ, Jisọs ji ịdọ aka na ntị zilaga ya, 44ọ gwara ya sị, “Hụkwa na ọ dịghị onye ọbụla ị ga-agwa ihe a. Kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị. Chụọkwa aja dị ka Mosis nyere nʼiwu, maka ime ka ị dị ọcha gị, ka ọ bụrụ ihe ama nye ha.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.